Here, epic adventures meet timeless wisdom, & traditional dances with emotion. We bring ancient folktales to life, carrying lessons to every heart that listens.
Ụzụ hịọrọ ebe niile ozigbo Agụiyi lọtara ka ụmụ anụmanụ bi n'ala hapụsịrị ya. Ndị bi na mmiri mere Agụiyi onyeisi ha. N'ikpeazụ ha nwetara nwere onwe ha na-achọ ma ha amaghị n'ezi ọchịchị abụghị ihe a na-enweta site n'oke mkpọtụ.
Ncheta Mejọ Christopher Ifeakandụ Ọkigbo
N’ụbọchị taa n’afọ 1932 ka a mụrụ Christopher Ọkigbo. Ọ bụ onye Ojoto nke dị n'Anambra Steeti. Chris kwuru hoo haa na ọ lọọrọ nne ya ochie ụwa. Ọ gara akwụkwọ na Gọọmentị Kọlegi Ụmụahịa
Ozi N'usoro
1/5
Language is Wealth
Wealth is not only money or land rather the wisdom, memory, and identity a people carry in their own tongue.
Read the full essay👇🏾👇🏾
https://t.co/dDhtt7WaA8 as written by Chioma Ohanwe
Ọ bụ mmasị gị ka nwa gị mara asụ Igbo?
Ị chọrọ nkụzi dị mfe, ga-ekwekwa ha nghọta?
Mmalite njem ọmụmụ asụsụ Igbo ụmụ gị taa na weebụ saịtị anyị.
Ya gazie.
Nwa gị ama ABỊCHỊỊ Igbo?
Ọ ma asụ Igbo?
Ọ na-aghọtakwa ma a sụọrọ ya?
Ọ bụrụ na ọ na-eri mperi, biko mmalite njem ọmụmụ asụsụ Igbo ya taa.
Ga na Weebụ Saịtị anyị https://t.co/kb1MVxG0FF ma pịa "Subscribe Button."
Ọ kwa eme ngwa emeghara ọdachi.
Ncheta Ụbọchị A Mụrụ Patrick Nnaemeka Okorie
Patoranking gbara afọ iri atọ na isii n'ụbọchị taa. Ekpere anyị bụ ka ahụike, ogologo ndụ, amara na akụnaụba bara ya ụba. Ọ ga na-aga n'ihu n'ebe ọrụ aka ya dị. Olu o ji a gụ egwu na-enye ụmụ mmadụ obi ụtọ agaghị agụ́ maọlị. Ndị ajọ mmụọ na ajọ mmadụ agaghị ahụkwa ndị ezinaụlọ ya.
Ya gazie. 🎼🎶🎂🥂🎉
🕊️ Ncheta Chukwuemeka Ike (1934–2020)
Mgbe odeakwụkwọ hapụrụ ụwa a, ihe fọdụrụ bụ akụkọ ya.
N’ụbọchị taa n’afọ 2020, Chukwuemeka Ike zara oku ọnwụ.
Ọ bụ onye Ndịkeliọnwụ, Anambra Steeti, ma bụrụkwa eze na-achị obodo ya tupu ọ nwụọ, dịka nna ya si bụrụ.
Chukwuemeka Ike bụ onye gụrụ akwụkwọ nke ọma ma jiri ya rụọ ọrụ bara uru.
Ọ gụrụ akwụkwọ na Government College, Ụmụahịa na University of Ibadan. Mesịa gaa Stanford University na mba Amerịka.
Akwụkwọ o dere gụnyere:
Toads for Supper (1965)
The Naked Gods (1970)
The Potter’s Wheel (1973)
Sunset at Dawn (1976)
Expo ’77 (1980)
The Chicken Chasers (1980)
The Bottled Leopard (1985)
Our Children Are Coming (1990)
🕯️ Ọ bụ ezie na ọ laala mmụọ mana anyị ka ji akwụkwọ ndị o deere wee na-echeta ya.
Ka mkpụrụ obi ya na-ezu ike n’udo.
Amen 🙏🏾
Mbe stole the meat 🐢
Mbe escaped.
The He-Goat was humiliated 🐐
Igbo folktales don’t always reward innocence.
They teach reality.
#AfricanFolktale#IgboStories#Storytelling
Ezi binyere Mbe ego che na ebe ha abụọ bụ enyi na Mbe ga-akwụ ụgwọ ma oge ruo dịka o si kwuo. Ezi amaghị na naanị ahịa Mbe abụọ zukọrọ ka uru anaghị adị. Ihe ọ bụla Mbe na anụmanụ ọzọ mekọrọ bụ naanị Mbe ka ọ na-abara uru.
Ifo Chakpii
Woo!!!
They roasted a fat chicken 🍗
The smell filled the yard.
They stepped inside...
Came back.
VIAM!
GONE.
"Did it fly away?"
Something was not right. 👀
Why The He-Goat Smells Badly.
#africanfolktale#ntori#storytelling
"Nwoke kpọrọ ndị ụmụnna ya oriri e meghị ka agụụ ghara ịgụ ha ọzọ. Ha niile nwere nri n'ụlọ ha. Mgbe anyị gbakọtara ọnụ n'ezi obodo, ọ bụghị maka ọnwa na-etinu, maka onye ọ bụla ga-ahụkwa ya ma ọ nọrọ n'ụlọ ya.
Anyị gbakọtara ọnụ, maka ọ bụ ihe ziri ezi ka ụmụnna gbakọta ọnụ."
Chinụa Achebe
(1930 - 2013)
Mgbada malitere ịnyere ụmụ anụmanụ aka mgbe agụụ na ahụhụ malitere kpụwa ha isi. Ka ọ chọpụtara na ọ nyere ha aka gawa, ego ya agwụ.
Ihe o ji a zaa odogwu agaghị adịzị maka ọgaranya ga na-eme nke o ji bụrụ ọgaranya tutu elelie ya ka nwa ogbenye.
Mbido Igbo Akụkọ Ifo
Ihe Mere Ezi Ji Adụ Imi Ya N'Ala.
Short Video
#akukoifo #folklore #folkstories #folktales #IgboAmaka
Ihe Mere Ezi Ji Adụ Imi Ya N'Ala
Were ụtụtụ chọwa ewu ojii tutu chi ejie maka ọ bụ nkụ onye kpara na ọkọchi ka ọ ga-aṅa na udu mmiri. Anaghịkwa amụ akaekpe na nkà. Ụwa bụkwa onye rụọ, o rie.
Onye nwere ntị ya nụrụ.
#IgboAmaka#folklore#akukoifo#folktales #folkstories
🕊️ Ncheta Samuel Ọnụnaka Mbakwe (1927–2004)
❓ Mgbe oge gọvanọ bịara na njedebe, gịnị ka a ga-eji cheta ya? Aha ya ka ọ bụ ọrụ ya?
N’ụbọchị taa n’afọ 2004, Samuel Ọnụnaka Mbakwe zara oku ọnwụ.
A mụrụ ya n’afọ 1927 n’Avụtụ, Obowo, Imo Steeti.
Sam Mbakwe bụ gọvanọ Imo Steeti n’okpuru ndọrọndọrọ ọchịchị NPP, n’oge ọchịchị Shehu Shagari.
Ọ chịrị Imo Steeti site n’afọ 1979 ruo 1983, ma a na-agụ ya taa dịka otu n’ime gọvanọ ndị bụ ọpụrụ iche n'ala Igbo.
N’oge ọ nọ n’ọchịchị, Sam Mbakwe gosiri na ọchịchị bụ maka ịrụ ọrụ. Ọ bụghị maka nkwari ego a ga-eji rụọ ọrụ.
🛣️ Ọ malitere Sam Mbakwe Motor Park, Owerri.
🏭 Wulitekwa ụlọọrụ na-emepụta akarangwa dị iche iche.
💡 Nyekwa ọtụtụ obodo ọkụ latriki.
🚰 Gbapuo mmiri nye ọtụtụ obodo n'Imo Steeti.
🛤️ Rụọ ụzọ dị iche iche.
🎓 Bulie Alvan Ikoku College of Education, Owere n’ọkwa dị elu, ebe a na-enweta nzere BA, MA, BSc, na MSc.
Sam Mbakwe jụrụ ka enye ndị Igbo azụ oche.
Ọ na-eti mkpu kwa mgbe ka ndị Igbo nweta oke ruru ha.
N’ihi àgwà a, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ibe ya kpọrọ ya: 👉 “Gọvanọ Obe Akwa.”
Tupu ọ banye n'ọchịchị, Imo Steeti nọ n’ọnọdụ ndụ, ọnwụ ka mma.
Ma n’oge Sam Mbakwe, ọnọdụ steeti a gbanwere nke ukwuu. Ihu onye ọ bụla bụkwa sọ ọchị.
👉 N’ezie, naanị ọrụ anyị ka a ga-eji cheta anyị.
💬 Kedụ otu ihe Sam Mbakwe mere iji e cheta ya ruo taa?
📌 Kesaa ka ndị ntorobịa mụta ihe site n’akụkọ a.
Daalụ nụ.
"Pride goeth before a fall" isn't just a saying... This is exactly what happened to the bully when Torotoro finally stood his ground.
Never mistake silence for weakness🦃🐔����🍁🍂
Full story on our YouTube channel.
Ncheta Nzukọ Aburi
N’ụbọchị taa n'afọ 1967 ka ndị Biafra nke Ojukwu bụ onye ndu ha na ndị Naịjirịa nke Gowon bụkwa onye ndu ha chịkọtara nkata ha kpara na nzukọ na Aburi, Gana. Ebe a ka ha kwekọrịtara na agaghị eji agha wee kpee udo maka nghọtahie dị n'etiti ha abụọ.
Ọzọkwa, ha nwere nghọta banyere ihe ndị ọzọ kwesịrị ịweta udo. Mana ka ha lọtara, ndị Naịjirịa ha na ha gara nta agwa ndị Biafra n'ụkwụ ha dịkwasị ka ụkwụ anụ. Ya bụ na ekwenyeghịsịkwa n'ụfọdụ ihe dị mkpa e kwekọrịtara na Aburi.
Ndị Biafra wee kpebie na ha ga-anọrọ onwe ha, mana ndị Naịjirịa jụrụ jubepụ isi. Nya ndị Naịjirịa jụrụ ịga aga, jụkwazịa ịcha acha. Ọ bụ otu a ka agha Biafra si wee daa, nke ihe karịrị nde mmadụ atọ nwụrụ n'ime ya.
Ya dịbakene 😔😞😟